AJO ANU (Si n'aka Akachukwu Vitalis)

N'etiti atọ ndị a, olee nke ị kacha wee kpọrọ ásị̀?
N'agbanyeghị na ha niile nwere ŋ̀kù, otu n'ime ha abụghị nnụnụ!
Anụmanụ atọ ndị a na-eyizi ọtụtụ mmadụ egwu, n'ihi na ha jọọrọ ezigbo njọ.
Ụfọdụ si na ọ pụtara ihe ọjọọ, maọbụ ákàrà ọjọọ, ma ị hụ nke ọbụla n'ime ha, na nrọ maọbụ n'ụlọ gị.
 
𝐈̀𝐤𝐰𝐢̀𝐤𝐰𝐢̄𝐢́
Ìkwìkwī bụ ńnụ̀nụ̀. O bi n'ime-ime oke ọhịa, (maọbụ "ajọ ọhịa", dị ka nkwenye ụfọdụ siri wee dị), n'elu oke osisi.
Ŋ̀kù ya dị ezigbo ogologo.
N'agbanyeghị na o pere mpe n'anya ndị mmadụ, ọ bụ ńnụ̀nụ̀ sikwara ike nke úkwû.
Ìkwìkwī na-egbuzịkwa nnukwu anụ, tụmadị, anụmanụ karịrị ya!
O nwere anya úkwú dị oke omimi na-elegharị warawara ma na-agbaa okirikiri mgbe ọbụla.
Ìkwìkwī bụ Dịńtā. Ọ na-achụzị ńtā nke ya n'ime n'abalị. O nweghị ézē mànà ọ na-ataa anụ, ma nke siri ike !. Ọnụ o jiri na-ataa ya bụ anụ sikwara ike.
Ndị mmadụ kpọrọ ìkwìkwī maka ŋ́kwenye ha na mgbe ụfọdụ, ndị mmụọ ọjọọ maọbụ amụsụ na-aghọrọ ìkwìkwī, ịtinye mmadụ ụ́jọ̄ n'ahụ, maọbu mẹrụ ya ahụ.
Ụfọdụ kwenyere na ọ bụrụ na mmadụ hụrụ ìkwìkwī n'elu gbam-gbam ụlọ ya, o gosiri na otu mmadụ anwụọla n'ime ezin'ụlọ ya maọbụ Ihe mberede na-achọọ ịwere ọnọdụ.
Site na mgbe ochie, ruo taa, anaghị ejiri ìkwìkwī achụ àjà.
 
𝐔̣́𝐬𝐮̣́
Ụsụ sòkwà na òtù ndị anụmanụ kachasị wee dịrị omimi n'ụwa.
Site na nkọmịrịkọ na akụkọ ifo d'iche-iche, ndị nna nna anyị akọọrọla na nghọta nke ha, ihe mere ụsụ jiri dị omimi etụ a.
Ụsụ abụghị nnụnụ, n'ihi na ọ dịghị akpáá àgwà ka ụmụ nnụnụ. Ndị be anyị sị na "ụsụ abụghị anụ elu, ọ bụghị anụ ala".
Ụsụ nwere êzē, ebe ụmụ nnụnụ enweghị. Ọ naghị eyiri àkwā, n'ihi na ọ na-amụrụ nwa site n'ahụ ya. O sokwa n'òtù ụmụ anụmanụ ndị nwere mmịrị árá.
Ụmụ nnụnụ nwere ọnụ dị ogologo. Ọnụ ụsụ dị ka nke òké .
Ọtụtụ ihe mere ka ụsụ jiri wee dị omimi. Ha gụnyere ndị a:
• Ụsụ nwere-ike ị dị ndụ ruo ihe dị ka afọ iri atọ.
• Ụsụ na-efeezị oke ọsịsọ. O nwere-ike ị jírí otu elekere, gafee ihe dị ka maịlị iri isii!
• Ụsụ dị n'ụdị n'ụdị. Ụdịrị ụsụ karịrị otu puku na narị anọ.
• Ụsụ nwere otume dị ka mmadụ!
• Ụsụ na-efeekarị n'abalị.
• O jiri ụda amata ebe ihe oriri ya dị. Nke a pụtara na ntị ya dị ezigbo nkọ.
• Ụsụ na-atụgharị onwe ya ma ọ chọọ ịrahụ ụra.
• Ụsụ sokwa na òtù ụmụ anụmanụ na-agbasaakarị nrịanrịa.
Mana, ị ma na ụsụ bara óké uru n'ụwa anyị a? Ewezụga enyemaka ụsụ site na ịgbasaasị ọtụtụ mkpụrụ, ụfọdụ mkpụrụ osisi anyị hụrụ n'anya, dịka Ujiri, Ube-bekee, Apụlụ, ube, n'ime ndị ọzọ, agaghị adị taa !.
Ụfọdụ na-ata anụ ụsụ ata, ebe ụfọdụ na-asọ ya asọ. Nke a dabere na nkwenye mpaghara obodo ọbụla.
 
𝐔̀𝐝𝐞̀𝐥𝐞̀
Ùdèlè bụ nnụnụ ọzọ a kpọrọ ásị̀ n'ọtụtụ mpaghara Afrịka, tụmadị n'alaIgbo. Ọ jọrọ ezigbo njọ wee dị omimi.
O nwere ólú ogologo, ọnụ ogologo na ányá ukwu.
Ọ na-efee-efee dị ka nnụnụ ndị ọzọ na-ataa óké anụ.
 
Ihe mere ọtụtụ ndị mmadụ jiri kpọọ ùdèlè ásị̀ karịa etu ahụ abụghị naanị maka ezigbo njọ ahụ ọ jọrọ maọbụ anụ ọ na-ataa, n'ihi na o nwere ụmụ anụmanụ na-ataa anụ ma
jọkarị ùdèlè na njọ, kama, ụjọ ùdèlè pụtakarị ìhè n'etiti ụmụ nnụnụ.
 
Ùdèlè anaghị achụ ńtā anụ ọ ga-ataa, kama, ọ na-eri nke anụ ọzọ gbùrù maọbụ nke nwụrụ n'onwe ya maọbụ nke ọrịa maọbu ihe ndị ọzọ gbùrù. Ya mere, ọ na-eché ka anụ nwụọ tụpụ o rie nri.
 
Ọ na-eri ihe rere-ere. Nke a mere a na-ahụkarị ùdèlè n'akụkụ ozu a hapụrụ ahapụ.
Ozu ọ na-eri gụnyere mmadụ!
Nke mere ndị mmadụ jiri kpọọ ya ásị̀ ma tụ ụjọ ya.
 
N'agbanyeghị nke ahụ, ozu na-edebe onwe ya ucha. O jiri ọnụ na-ehịcha onwe ya. Ọ na anọkarị n'elu oke osisi kpọrọ nkụ ma na efeezị ezigbo elu.
Ụfọdụ kwenyere na ùdèlè bụ ákàrà ọnwụ, n'ihi na ùdèlè dị ka kapịnta na-arụ akpatị-ozu. Ha abụọ agaghị eri nri maọbụrụ na mmadụ anwụghị.
 
Ya bụ na, ha abụọ na-ekpere Chineke ka mmadụ maọbụ anụ nwụọ, ka ha wee hụ ihe ha ga-eri, ebe ndị ọzọ na-ekpere Chineke ka o debe ha ndụ.
Kedụ nke Chineke ga-azaara?
Ee. Ọ bụ ihe mwute na ụfọdụ na-esi n'ọnwụ mmadụ ibe ha wee na-eri nri, mana,
marakwa na ndụ na ọnwụ bụ ụmụ ejima.
 
Ha abụọ ga-emerịrị mmadụ, ma ọ masịrị onye ahụ ma ọ masịghị ya. Ma ùdèlè maọbụ Kapịnta na-arụ akpatị-ozu kpere Chukwu ma ha ekpeghị, mmadụ ga-anwụrịrị !
 
Otu ụkabụilu gbasara udele bụ:
 
"Udele kwuru sị , n'agbanyeghị na ụmụ mmadụ anaghị ataa anụ m, a na-m edosa àkwá m ebe anya mmadụ agaghị ahụ, n'ihi na mmadụ ekwesịghị ntụkwasịobi.
 
Ùdèlè dị ezigbo mkpa n'ụwa anyị, n'ihi na ọ na-enyere aka i debe ụwa ucha. Ọ na-enye aka na mgbochi ọrịa na nrịanrịa, n'ihi na ozu rere-ere ahapụrụ ahapụ n'ime ọhịa nwere ike ị gbasaa ọrịa.
 
Ma ewẹpụ ndị nke ahụ, o nwere ihe ndị mmadụ kwesịrị ịmụta n'aka ùdèlè. Nke a bụ ndidi. Ùdèlè anaghị alụ ọgụ. Ọ naghị enyere onwe ya nsogbụ ịchọta ihe ọ ga-eri. O kwere na, ebe mmadụ na anụ na-anwụ kwa ụbọchị, ọ gaghị eburu ọnụ.
Nke a mere udele jiri nwee ndidi na okwukwe di ukwuu!
 
Mana, n'echiche ndi ọzọ, nke ahụ abụghị ndidi maọbụ okwukwe. Kama, ọ bụ umengwụ. Udele anaghị arụ oke ọrụ maọbụ taa ezigbo ahụhụ tụpụ o rie nri.
 
Ùdele na-adịkarị ka ọ na-arịa ọrịa kwa mgbe, maọbụ ihe agụụ na-agụgbụ.
 
Ma ị na-akpọ ụmụ anụmanụ ndị a ásị̀, chetakwa na ọ bụghị ha kèrè onwe ha etu ahụ, kama ọ bụ etu Chukwu siri wee chọọ ya.
 
Ụwa agaghị atọ́ ụtọ maọbụrụ na onye ọbụla maramma. Chukwu okike, n'ókè amamihe ya jiri ụfọdụ ihe jọrọ njọ wee chọrọ ụwa mma !
Anụmanụ atọ ndị a sokwa na ụmụ ihe Chukwu jiri wee chọọ ụwa mma.

TopBack to Top